9 Ma, unu enupụrụla Jehova isi;+ unu atụla ndị ala ahụ egwu,+ n’ihi na ha bụụrụ anyị ihe oriri. Ihe nchebe ha adịkwaghị,+ Jehova nọnyeere anyị.+ Unu atụla ha egwu.”+
3 Ọ ga-asị ha, ‘Nụrụnụ, Izrel, unu na-agaru nso taa ibuso ndị iro unu agha. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri.+ Unu atụla egwu wee jiri ụjọ gbaa ọsọ ma ọ bụ maa jijiji n’ihi ha,+
15 O wee sị: “Geenụ ntị, Juda dum na unu ndị bi na Jeruselem, tinyere Eze Jehọshafat! Nke a bụ ihe Jehova gwara unu, ‘Unu atụla egwu,+ unu amakwala jijiji n’ihi nnukwu ìgwè mmadụ a; n’ihi na agha a abụghị nke unu, kama ọ bụ nke Chineke.+
10 Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.+ Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị.+ M ga-eme ka ị dị ike.+ M ga-enyere gị aka.+ M ga-eji aka nri m+ nke ezi omume+ jidesie gị ike.’