8 Kama ọ bụ n’ihi na Jehova hụrụ unu n’anya,+ nakwa na ọ na-edebe iyi ọ ṅụụrụ nna nna unu hà,+ mere Jehova ji jiri aka dị ike kpọpụta unu,+ ka o wee napụta unu n’ụlọ ndị ohu,+ n’aka Fero eze Ijipt.
22 “Ya mere, sị ụlọ Izrel, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ụlọ Izrel, ọ bụghị n’ihi unu ka m ga-eme ya, kama ọ bụ n’ihi aha nsọ m nke unu metọrọ n’etiti mba dị iche iche unu batara.”’+