19 Onyinye+ niile dị nsọ, nke ụmụ Izrel ga na-enye Jehova, ka m nyere gị na ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom, ka ọ bụrụ òkè unu ruo mgbe a na-akaghị aka.+ Ọ bụ ọgbụgba ndụ nnu ruo mgbe a na-akaghị aka n’ihu Jehova maka gị na ụmụ gị.”+
6 Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka unu ga-eweta àjà nsure ọkụ+ unu na àjà nkịtị unu na otu ụzọ n’ụzọ iri+ unu na onyinye unu na-eweta+ na onyinye unu kwere ná nkwa+ na onyinye afọ ofufo+ unu na anụ ndị e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi unu nakwa n’ìgwè ewu na atụrụ+ unu.