20 “‘Otú ọ dị, onye amụma nke ji mpako were aha m kwuo ihe m na-enyeghị ya iwu ka o kwuo,+ ma ọ bụ nke kwuru okwu n’aha chi ọzọ,+ onye amụma ahụ ga-anwụ.+
14 Jehova wee sị m: “Ọ bụ amụma ụgha ka ndị amụma na-ebu n’aha m.+ Ọ bụghị m dunyere ha, enyeghịkwa m ha iwu, agwaghịkwa m ha okwu.+ Ọhụụ ụgha na ịgba afa na ihe na-abaghị uru+ na aghụghọ nke dị n’obi ha ka ha ji na-eburu unu amụma.+
3 Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na mmadụ ebuo amụma ọzọ, nna ya na nne ya, bụ́ ndị mụrụ ya, ga-asị ya, ‘Ị gaghị adị ndụ, n’ihi na i kwuwo okwu ụgha n’aha Jehova.’ Nna ya na nne ya, bụ́ ndị mụrụ ya, ga-ama ya ube n’ihi amụma o buru.+