15 Ị ga-eme ememme achịcha na-ekoghị eko.+ Ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko+ ụbọchị asaa, dị nnọọ ka m nyere gị n’iwu, n’oge a kara aka n’ọnwa Ebib,+ n’ihi na ọ bụ na ya ka i si n’Ijipt pụta. Ọ dịghịkwa onye ga-agba aka bịa n’ihu m.+
20 Ị ga-eji atụrụ gbara nwa mbụ ịnyịnya ibu mụrụ.+ Ma ọ bụrụ na ị gaghị agbara ya, ị ga-agbaji ya olu. Ị ga-agbara nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ime ụmụ gị ndị ikom.+ Ọ dịghị onye ga-agba aka bịa n’ihu m.+