16 Ọ bụ naanị na ọ gaghị eme ka ịnyịnya ya dị ọtụtụ,+ ma ọ bụ mee ka ndị Izrel laghachi n’Ijipt iji mee ka ịnyịnya dị ọtụtụ;+ ebe ọ bụ na Jehova agwawo unu, sị, ‘Ya adịla mgbe unu ga-esi n’ụzọ a laghachi azụ ọzọ.’
4 Devid wee jide otu puku na narị mmadụ asaa ya bụ́ ndị na-agba ịnyịnya nakwa puku mmadụ abụọ bụ́ ndị ji ụkwụ aga;+ Devid wee see+ ịnyịnya ụgbọala+ niile ha akwara, ma ọ hapụrụ otu narị ịnyịnya ụgbọala n’ime ha.