12 Jọshụa wee weghara obodo niile nke ndị eze a niile na-achị, nwụdekwa ndị eze ha niile ma were ihu mma agha gbuo ha.+ O bibiri ha,+ dị nnọọ ka Mozis ohu Jehova nyere n’iwu.+
11 “‘Unu wee gafee Jọdan+ bịarute Jeriko.+ Ndị nwe ala Jeriko, ndị Amọraịt na ndị Perizaịt na ndị Kenan na ndị Het na ndị Gegash, ndị Haịvaịt na ndị Jibọs malitere ibuso unu agha; ma m nyefere ha n’aka unu.+