26 Ha wee gakwuru Mozis na Erọn na nzukọ ụmụ Izrel dum n’ala ịkpa Peran, na Kedesh.+ Ha wee kọọrọ ha na nzukọ ahụ dum otú ha si jee, gosikwa ha mkpụrụ nke ala ahụ.
19 “Anyị wee si na Horeb kwalie gabiga nnukwu ala ịkpa+ ahụ dum nke dị egwu, bụ́ nke unu hụrụ, nke dị n’ụzọ e si aga ógbè ndị Amọraịt+ nke bụ́ ugwu ugwu, dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke anyị nyere anyị n’iwu; e mesịa, anyị bịarutere Kedesh-bania.+