8 Ha emewo ngwa ngwa hapụ ụzọ m nyere ha n’iwu ka ha na-agbaso.+ Ha emeworo onwe ha ihe oyiyi nwa ehi a wụrụ awụ, na-akpọkwara ya isiala ma na-achụrụ ya àjà, na-asị, ‘Izrel, lee Chineke gị, onye dupụtara gị n’ala Ijipt.’”+
12 Jehova wee sị m, ‘Bilie, si n’ebe a gbadaa ọsọ ọsọ, n’ihi na ndị gị bụ́ ndị ị kpọpụtara n’Ijipt emewo omume na-eweta mbibi.+ Ha emewo ngwa ngwa hapụ ụzọ m nyere ha iwu ka ha soro. Ha emeworo onwe ha ihe oyiyi a wụrụ awụ.’+