Ndị Ikpe
2 Mmụọ ozi+ Jehova wee si na Gilgal+ gbagoo Bokim+ wee sị: “M kpọpụtara unu n’Ijipt ma kpọbata unu n’ala m ṅụụrụ nna nna unu hà iyi inye ha.+ M sịkwara, ‘Agaghị m emebi ọgbụgba ndụ mụ na unu ma ọlị.+ 2 Unu na ndị bi n’ala a agbala ndụ.+ Kwatuonụ ebe ịchụàjà ha.’+ Ma unu egeghị ntị n’olu m.+ Gịnị mere unu ji mee ihe a?+ 3 Ya mere, mụ onwe m ekwuwo, sị, ‘Agaghị m achụpụ ha n’ebe unu nọ, ha ga-aghọkwara unu ọnyà,+ chi ha ga-aghọkwara unu ihe ụrà.’”+
4 O wee ruo na ozugbo mmụọ ozi Jehova gwara ụmụ Izrel ihe ndị a, ha malitere ịkwa ákwá n’olu dara ụda.+ 5 Ha wee gụọ ebe ahụ Bokim. Ha wee chụọrọ Jehova àjà n’ebe ahụ.
6 Mgbe Jọshụa hapụrụ ụmụ Izrel ka ha laa, ha lawara, onye nke ọ bụla n’ihe nketa ya, iji nweta ala ahụ.+ 7 Ha wee na-efe Jehova n’ụbọchị niile nke Jọshụa nakwa n’ụbọchị niile nke ndị okenye, bụ́ ndị dịrị ndụ mgbe Jọshụa nwụsịrị, ndị hụkwara oké ọrụ niile Jehova rụụrụ Izrel.+ 8 Jọshụa nwa Nọn, bụ́ ohu Jehova, wee nwụọ mgbe ọ gbara otu narị afọ na iri.+ 9 Ha wee lie ya n’ala o ketara nke dị na Timnat-hires+ n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu, n’ebe ugwu nke Ugwu Geash.+ 10 Ọgbọ ahụ dum nwụkwara dị ka ndị nna ha nwụrụ,+ e wee nwee ọgbọ ọzọ mgbe ha nwụchara, bụ́ ndị na-amaghị Jehova ma ọ bụ ọrụ ọ rụụrụ Izrel.+
11 Ụmụ Izrel wee malite ime ihe dị njọ n’anya Jehova,+ na-efekwa Bel.+ 12 Ha wee hapụ Jehova bụ́ Chineke ndị nna ha, onye kpọpụtara ha n’ala Ijipt,+ ha wee soro chi ọzọ n’etiti chi dị iche iche nke ndị gbara ha gburugburu,+ ha malitekwara ịkpọrọ ha isiala, nke mere na ha kpasuru Jehova iwe.+ 13 Ha wee hapụ Jehova ma malite ife Bel na ihe oyiyi Ashtọret.+ 14 Jehova wee weso Izrel iwe dị ọkụ,+ o wee nyefee ha n’aka ndị na-akwakọrọ ihe,+ ha wee na-akwakọrọ ihe ha; o wee were ha resị ndị iro ha gbara ha gburugburu,+ ha enweghịkwa ike iguzo n’ihu ndị iro ha.+ 15 Ebe ọ bụla ha gara, aka Jehova na-emegide ha iwetara ha ọdachi,+ dị ka Jehova kwuru, dịkwa ka Jehova ṅụụrụ ha n’iyi;+ ha wee nọrọ n’oké ihe isi ike.+ 16 Ya mere, Jehova na-enye ha ndị ikpe,+ ha na-azọpụtakwa ha n’aka ndị na-akwakọrọ ihe ha.+
17 Ha egeghị ọbụna ndị ikpe ha ntị, kama ha na chi ọzọ dị iche iche+ nwere mmekọahụ rụrụ arụ,+ ha wee kpọọrọ ha isiala. N’egbughị oge, ha hapụrụ ụzọ ndị nna nna ha jere ije na ya, bụ́ ndị rubere isi n’iwu Jehova.+ Ha emeghị otú ahụ. 18 Mgbe Jehova nyekwara ha onyeikpe,+ Jehova na-anọnyere onyeikpe ahụ, ọ na-azọpụtakwa ha n’aka ndị iro ha n’ụbọchị niile nke onyeikpe ahụ; n’ihi na ọ na-ewute Jehova+ na ha na-asụ ude n’ihi ndị na-emegbu ha+ na ndị na-akwagharị ha.
19 Ọ na-erukwa na mgbe onyeikpe ahụ nwụrụ, ha na-atụgharị mewe omume na-eweta mbibi karịa otú ndị nna ha mere site n’isoro chi ọzọ dị iche iche iji na-efe ha ofufe ma na-akpọrọ ha isiala.+ Ha akwụsịghị omume ha na àgwà isi ike ha.+ 20 N’ikpeazụ, Jehova wesoro Izrel iwe dị ọkụ,+ o wee sị: “Ebe ọ bụ na mba a emebiwo ọgbụgba ndụ m+ nke m nyere ndị nna nna ha n’iwu, ha egeghịkwa ntị n’olu m,+ 21 mụ onwe m agakwaghị achụpụ nke ọ bụla n’ime mba ndị Jọshụa hapụrụ mgbe ọ nwụrụ,+ 22 ka m wee site n’aka ha lee Izrel ule,+ ịmata ma hà ga-abụ ndị na-edebe ụzọ Jehova site n’ije ije na ya dị ka ndị nna ha debere ya, ma ọ̀ bụ na ha agaghị abụ.” 23 Jehova wee hapụ mba ndị a ka ha nọrọ, o wee ghara ịchụpụ ha ngwa ngwa,+ o nyefeghịkwa ha n’aka Jọshụa.