6 Ụmụ Izrel wee malite ọzọ ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova,+ ha malitekwara ife Bel+ na ihe oyiyi Ashtọret+ na chi ndị Siria+ na chi ndị Saịdọn+ na chi ndị Moab+ na chi ụmụ Amọn+ na chi ndị Filistia.+ Ha wee hapụ Jehova, ha efeghịkwa ya.+
18 O wee sị: “Ọ dịghị nsogbu+ m wetaara Izrel, kama ọ bụ gị na ụlọ nna gị wetaara Izrel nsogbu,+ n’ihi na unu ahapụwo ihe Jehova nyere n’iwu,+ unu wee soro Bel.+
23 Gịnị mere ị ga-eji sị, ‘Emerụghị m onwe m.+ Esoghịkwa m Bel’?+ Lee ụzọ gị nke dị na ndagwurugwu.+ Mara ihe i mere. Nwa agbọghọ kamel nke dị garagara, nke na-agbagharị n’ụzọ ya n’efu;
13 M ga-eme ka ọ zaa ajụjụ+ maka ụbọchị niile ọ nọ na-esurere ihe oyiyi Bel+ ihe nsure ọkụ,+ mgbe o ji ọla ntị ya na ihe ịchọ mma ya na-achọ onwe ya mma,+ na-agakwurukwa ndị ya na ha na-eme enyi,+ ma, ọ bụ m ka o chefuru,’+ ka Jehova kwuru.