13 Gidiọn wee bịarute, ma, lee! otu nwoke nọ na-akọrọ ibe ya nrọ ọ rọrọ, sị: “Nke a bụ nrọ m rọrọ.+ Lee! e nwere achịcha ọka bali dị okirikiri nke kpọreere banye n’ebe ndị Midian mara ụlọikwuu. O wee rute n’otu ụlọikwuu, kụọ ya, o wee daa,+ o wee kpuo ụlọikwuu ahụ ihu n’ala, o wee daruo ala.”