14 Ị ga-aghọ onye a kasị gọzie agọzi n’etiti ndị niile.+ Ọ dịghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị nọ n’ime gị nke na-agaghị amụta nwa, ọ dịghịkwa anụ ụlọ gị nke na-agaghị amụta nwa.+
19 Ha wee bilie n’isi ụtụtụ, daakwa n’ala n’ihu Jehova, e mesịa, ha lara ma bata n’ụlọ ha na Rema.+ Elkena na nwunye ya bụ́ Hana wee nwee mmekọahụ,+ Jehova wee malite icheta ya.+