Ọpụpụ 22:28 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 28 “Akọchala Chineke,+ abụkwala onyeisi n’etiti ndị gị ọnụ.+ 1 Ihe E Mere 16:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 Sị, ‘Unu akpala ndị m tere mmanụ aka,Unu emekwala ndị amụma m ihe ọjọọ ọ bụla.’+ Abụ Ọma 105:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Sị: “Unu akpala ndị m tere mmanụ aka,+Unu emekwala ndị amụma m ihe ọjọọ ọ bụla.”+ Ọrụ Ndịozi 23:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Pọl wee sị: “Ụmụnna m, amaghị m na ọ bụ nnukwu onye nchụàjà. N’ihi na e dere, sị, ‘Ekwula okwu ọjọọ banyere onye na-achị ndị gị.’”+
5 Pọl wee sị: “Ụmụnna m, amaghị m na ọ bụ nnukwu onye nchụàjà. N’ihi na e dere, sị, ‘Ekwula okwu ọjọọ banyere onye na-achị ndị gị.’”+