40 Ndị bi ha nso, ruo Ịsaka+ na Zebulọn+ na Naftalaị,+ jikwa ịnyịnya ibu+ na kamel na jakị na ehi na-ebute ihe oriri ndị e ji ntụ ọka mee,+ mbadamba achịcha mkpụrụ fig+ na achịcha mkpụrụ vaịn a mịrị amị+ na mmanya+ na mmanụ+ na ehi+ na atụrụ,+ n’ụba, n’ihi na a na-aṅụrị ọṅụ+ n’Izrel.