Ilu 12:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 Ọ bụ onye nzuzu na-egosipụta iwe ya n’otu ụbọchị ahụ,+ ma onye maara ihe na-ekpuchi ihe ihere.+ Ilu 14:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Onye na-ewe iwe ọsọ ọsọ ga-eme omume nzuzu,+ ma onye nwere ikike iche echiche ka a na-akpọ asị.+ Ilu 26:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Azala onye ọ bụla dị nzuzu dị ka nzuzu ya si dị, ka gị na ya ghara ịbụ otu ihe ahụ.+ Ndị Rom 12:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.+