45 Devid wee gwa onye Filistia ahụ, sị: “I ji mma agha na ube na árọ̀+ na-abịa izute m, ma m ji aha Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ bụ́ Chineke nke ndị agha Izrel, onye ị maworo aka,+ na-abịa izute gị.
17 N’ikpeazụ, Sọl sịrị Devid: “Lee ada m bụ́ Mirab.+ Ọ bụ ya ka m ga-akpọnye gị ka ọ bụrụ nwunye gị.+ Naanị gosi m na ị bụ dike, lụọkwa agha Jehova.”+ Ma Sọl gwara onwe ya, sị: “Ka m ghara ịkpa ya aka, kama ka ọ bụrụ ndị Filistia ga-akpa ya aka.”+
2 Ma ụnyaahụ ma n’oge gara aga+ mgbe Sọl bụ eze anyị, ọ bụ gị na-eduru Izrel apụ ma na-akpọlata ha.+ Jehova wee sị gị, ‘Ọ bụ gị ga-azụ ndị m Izrel dị ka atụrụ,+ ọ bụkwa gị ga-abụ onye ndú+ Izrel.’”