17 bụ́ onye ga na-apụ, na-abata n’ihu ha, onye ga na-edu ha na-apụ, na-edu ha na-abata,+ ka nzukọ Jehova ghara ịdị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.”+
13 N’ihi ya, Sọl wepụrụ ya ka ya na ya ghara ịdị na-anọ+ ma họpụta ya ịbụ ọchịagha otu puku ndị agha; ọ na-apụkwa ma na-abata mgbe niile n’ihu ndị Izrel.+
28 Biko, gbaghara ohu gị nwaanyị+ mmejọ ya, n’ihi na Jehova ga-ewuru onyenwe m ụlọ na-adịgide adịgide,+ n’ihi na ọ bụ agha Jehova ka onyenwe m na-alụ;+ a gaghịkwa ahụ ihe ọjọọ ọ bụla n’ime gị n’ụbọchị gị niile.+