28O wee ruo n’oge ahụ na ndị Filistia malitere ịkpọkọta ndị agha ha ka ha buso Izrel agha.+ Ekish wee sị Devid: “Ị maara nke ọma na ọ bụ m ka ị ga-eso gaa agha, gị na ndị ikom gị.”+
2 Ndị isi+ ndị Filistia nọ na-agafere n’ìgwè dị otu narị mmadụ otu narị mmadụ nakwa n’ìgwè dị otu puku mmadụ otu puku mmadụ, Devid na ndị ikom ya so Ekish na-agafe mgbe ha gafesịrị.+