51 Devid wee gbara ọsọ gaa guzoro n’akụkụ onye Filistia ahụ. O wee were mma agha nwoke ahụ,+ mịpụta ya n’ọbọ ya ma gbunyụọ ya anya mgbe o ji ya gbupụ ya isi.+ Ndị Filistia wee hụ na dike ha anwụọla, ha wee gbaa ọsọ.+
9 Ha wee yipụ ya ihe o yi, gbupụ ya isi,+ werekwa ihe agha ya ma ziga ozi n’ala ndị Filistia gbaa gburugburu iji gwa+ arụsị ha+ na ndị obodo ha ihe merenụ.