1 Ihe E Mere
10 Ndị Filistia+ wee buso Izrel agha; ndị Izrel wee si n’ihu ndị Filistia gbaa ọsọ, e wee na-egbu ha, ha ana-ada n’Ugwu Gilboa.+ 2 Ndị Filistia wee chụsie Sọl na ụmụ ya ọsọ ike; ndị Filistia wee gbuo Jọnatan+ na Abinadab+ na Malkaị-shua,+ ụmụ Sọl.+ 3 Ọgụ ahụ wee siere Sọl ike; ndị na-agba ụta wee mesịa hụ ya. Ndị ahụ na-agba ụta wee merụọ ya ahụ́.+ 4 Sọl wee sị onye na-eburu ya ihe agha:+ “Mịrị mma agha+ gị maa m, ka ndị a a na-ebighị úgwù+ ghara ịbịa mee m ihe na-adịghị mma.”+ Ma onye na-eburu ya ihe agha ekweghị,+ n’ihi na egwu ji ya nke ukwuu. Sọl wee mịrị mma agha ya wee dakwasị na ya.+ 5 Mgbe onye na-eburu ya ihe agha hụrụ na Sọl anwụwo, ya onwe ya kwa dakwasịrị ná mma agha ya wee nwụọ.+ 6 Sọl na ụmụ ya atọ wee si otú a nwụọ,+ ndị ụlọ ya niile nwụkọtara ọnụ. 7 Mgbe ndị Izrel niile nọ na ndagwurugwu hụrụ na ha agbawo ọsọ, nakwa na Sọl na ụmụ ya anwụwo, ha malitere ịhapụ obodo ha gbaa ọsọ;+ e mesịa, ndị Filistia batara biri na ha.
8 O wee ruo n’echi ya na mgbe ndị Filistia bịara iyipụsị+ ndị e gburu egbu ihe ha yi, ha hụrụ Sọl na ụmụ ya ka ha tọgbọ n’Ugwu Gilboa.+ 9 Ha wee yipụ ya ihe o yi, gbupụ ya isi,+ werekwa ihe agha ya ma ziga ozi n’ala ndị Filistia gbaa gburugburu iji gwa+ arụsị ha+ na ndị obodo ha ihe merenụ. 10 N’ikpeazụ, ha debere ihe agha ya n’ụlọ arụsị ha,+ ha kedokwara okpokoro isi ya n’ụlọ Degọn.+
11 Ndị niile bi na Jebesh+ nke dị na Gilied wee nụ ihe niile ndị Filistia mere Sọl.+ 12 Ndị dike niile wee bilie gaa buru ozu Sọl na ozu ụmụ ya bute ha Jebesh ma lie ọkpụkpụ ha n’okpuru nnukwu osisi+ dị na Jebesh;+ ha wee buo ọnụ+ ụbọchị asaa.
13 Sọl wee si otú a nwụọ n’ihi omume ekwesịghị ntụkwasị obi ya nke o ji enweghị okwukwe+ meso Jehova n’ihe metụtara okwu Jehova nke ọ na-edebeghị nakwa n’ihi ịgwa onye na-agba afa+ ka ọ jụọrọ ya ase. 14 Ọ jụghịkwa Jehova ase.+ N’ihi ya, o mere ka ọ nwụọ ma nyefee Devid nwa Jesi ọchịchị.+