25 Jehova ga-eme ka e merie gị n’ihu ndị iro gị.+ Otu ụzọ ka ị ga-esi gaa ibuso ha agha, ma ị ga-esi n’ụzọ asaa gbaa ọsọ n’ihu ha; ị ga-aghọkwa ihe ga-eme ka alaeze niile nke ụwa tụọ ụjọ.+
6 Ndị Izrel wee hụ na ha nọ n’oké ihe isi ike,+ n’ihi na ihe taara ha akpụ; ha wee na-ezo onwe ha n’ọgba+ nakwa n’oghere dị na nkume nakwa na nkume ndị dị elu nakwa n’oghere ndị dị n’okpuru ala nakwa n’olulu mmiri.
7 Mgbe ndị Izrel ndị nọ n’ógbè ndagwurugwu nakwa n’ógbè Jọdan hụrụ na ndị Izrel agbawo ọsọ, nakwa na Sọl na ụmụ ya anwụwo, ha malitere ịhapụ obodo ndị ahụ gbaa ọsọ,+ e mesịa, ndị Filistia batara biri na ha.+