33 Ndị ị na-amaghị ga-eri mkpụrụ nke ala gị na ihe niile ị rụpụtara;+ ị ga-aghọkwa naanị onye a na-erigbu erigbu na onye a na-echi ọnụ n’ala mgbe niile.+
7 Mgbe ndị Izrel niile nọ na ndagwurugwu hụrụ na ha agbawo ọsọ, nakwa na Sọl na ụmụ ya anwụwo, ha malitere ịhapụ obodo ha gbaa ọsọ;+ e mesịa, ndị Filistia batara biri na ha.