12 Nne ehi ndị ahụ wee gawa kpọmkwem n’okporo ụzọ gara Bet-shimesh.+ Ha nọ na-aga n’otu okporo ụzọ, na-ebe ubé ka ha na-aga, ha ahapụghịkwa ụzọ ahụ gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe. N’oge ahụ niile, ndị isi+ ndị Filistia nọ na-eso ha n’azụ ruo n’ókè nke ala Bet-shimesh.