17 aghaghị m ịgọzi gị, aghaghịkwa m ime ka mkpụrụ gị mụbaa dị ka kpakpando nke eluigwe nakwa dị ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri;+ mkpụrụ gị ga-enwetakwa ọnụ ụzọ ámá ndị iro ya.+
12 Ndị Midian na ndị Amalek na ndị niile si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ+ jupụtara na ndagwurugwu ahụ dị ka igurube;+ kamel ha+ enweghị ngụta, ha dị ọtụtụ dị ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri.