54“Tie mkpu ọṅụ, gị nwaanyị aga nke na-amụghị nwa!+ Nwee obi ụtọ, tiekwa mkpu ọṅụ, tisie mkpu ike,+ gị onye ime na-emeghị,+ n’ihi na ụmụ nke nwaanyị a gbahapụrụ agbahapụ dị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwaanyị nwere di,”+ ka Jehova kwuru.
27 N’ihi na e dere, sị: “Nwee ọṅụ, gị nwaanyị aga nke na-adịghị amụ nwa; tie mkpu ọṅụ, tisie ya ike, gị nwaanyị nke ime na-adịghị eme; n’ihi na ụmụ nke nwaanyị a gbahapụrụ agbahapụ dị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwaanyị nwere di.”+