4 A gakwaghị akpọ gị nwaanyị a hapụrụ kpamkpam;+ a gakwaghị asị na ala gị bụ ebe tọgbọrọ n’efu;+ kama a ga-akpọ gị Onye Ihe Ya Na-atọ M Ụtọ,+ kpọọkwa ala gị Nwunye E Nwe Enwe. N’ihi na ihe gị ga-atọ Jehova ụtọ, a ga-enwekwa ala gị enwe dị ka nwunye.+
27 N’ihi na e dere, sị: “Nwee ọṅụ, gị nwaanyị aga nke na-adịghị amụ nwa; tie mkpu ọṅụ, tisie ya ike, gị nwaanyị nke ime na-adịghị eme; n’ihi na ụmụ nke nwaanyị a gbahapụrụ agbahapụ dị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwaanyị nwere di.”+
12E wee hụ oké ihe ịrịba ama+ n’eluigwe, ya bụ, otu nwaanyị+ nke yi anyanwụ dị ka uwe, ọnwa dịkwa n’okpuru ụkwụ ya, o kpukwa okpueze nke bụ́ kpakpando iri na abụọ n’isi ya.