54“Tie mkpu ọṅụ, gị nwaanyị aga nke na-amụghị nwa!+ Nwee obi ụtọ, tiekwa mkpu ọṅụ, tisie mkpu ike,+ gị onye ime na-emeghị,+ n’ihi na ụmụ nke nwaanyị a gbahapụrụ agbahapụ dị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwaanyị nwere di,”+ ka Jehova kwuru.
5 “N’ihi na Onye Ukwu nke kere gị+ bụ di nwe gị,+ Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya;+ Onye Nsọ Izrel bụkwa Onye Mgbapụta gị.+ A ga-akpọ ya Chineke nke ụwa dum.+