20 Devid wee bilie n’isi ụtụtụ hapụ ìgwè atụrụ ahụ n’aka onye na-elekọta atụrụ, buru ihe ndị ahụ gawa dị nnọọ ka Jesi nyere ya n’iwu.+ Mgbe ọ batara n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu,+ ìgwè ndị agha nọ na-aga n’ọgbọ agha,+ ha wee tie mkpu agha.
38 Ndị a niile bụ ndị agha, ndị na-aga agha; ha ji obi zuru ezu+ bịa na Hibrọn ka ha mee Devid eze Izrel dum; ndị niile fọdụrụ n’Izrel jikwa otu obi chọọ ka e mee Devid eze.+