39 N’ihi na dị nnọọ ka Jehova, bụ́ Onye Nnapụta Izrel, dị ndụ, ọ bụrụgodị na ọ bụ Jọnatan nwa m mere ya, ọ ga-anwụrịrị.”+ Ma ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị ahụ niile zara ya ihe ọ bụla.
10 Ma, Jehova bụ Chineke n’eziokwu.+ Ọ bụ Chineke dị ndụ,+ bụrụkwa Eze ruo mgbe ebighị ebi.+ Ụwa ga-ama jijiji n’ihi iwe ya,+ ọ dịghịkwa mba ga-eguzo mgbe ọ ga-eweta amamikpe ya.+