27 O wee ruo na ngwa ngwa Devid bịarutere Mahaneyim, Shobaị nwa Nehash, bụ́ onye Raba+ nke ụmụ Amọn,+ na Mekia+ nwa Amiel+ onye si Lo-diba, na Bazilaị+ onye Gilied nke si Rogilim+
7 “Ị ga-egosikwa ụmụ Bazilaị+ onye Gilied obiọma,* ha ga-esokwa ná ndị na-eri ihe na tebụl gị;+ n’ihi na otú ahụ ka ha bịara m nso+ mgbe m gbapụrụ n’ihu Absalọm nwanne gị.+