13 Gwakwanụ Amesa, sị,+ ‘Ọ̀ bụ na mụ na gị abụghị otu ọkpụkpụ na otu anụ ahụ́? Ka Chineke mee m otú a, ka ọ tụkwasịkwa ihe na ya+ ma ọ bụrụ na ị gaghị abụ onyeisi ndị agha n’ihu m mgbe niile n’ọnọdụ Joab.’”+
10 Ma anya Amesa adịghị ná mma agha Joab ji n’aka; o wee were ya maa+ ya n’afọ, eriri afọ ya wee wụpụtasịa n’ala, ya ahapụzie ịma ya ọzọ. O wee nwụọ. Joab na Abishaị nwanne ya nwoke wee chụrụ Shiba nwa Bikraị gawa.