20 Mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emehie, ọ bụ ya ga-anwụ.+ Nwata agaghị aza ajụjụ ọ bụla maka njehie nna ya, nna agaghịkwa aza ajụjụ ọ bụla maka njehie nwa ya.+ Ezi omume nke onye ezi omume ga-adị n’isi ya,+ ajọ omume nke onye ajọ omume ga-adịkwa n’isi ya.+