6 O sikwa n’ụlọ Jehova bupụta ogwe osisi ahụ dị nsọ,+ buga ya ná mpụga Jeruselem, na ndagwurugwu Kidrọn, wee suo ya ọkụ+ na ndagwurugwu Kidrọn, gweriekwa ya ka ọ ghọọ ntụ ma wụfuo ya n’ebe a na-eli+ ndị nkịtị.
18Mgbe Jizọs kwusịrị ihe ndị a, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ wee gafee iyi Kidrọn+ gaa n’ebe e nwere ubi. Ya na ndị na-eso ụzọ ya banyekwara n’ime ya.+