15 “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gwara Taya, ‘Mgbe a nụrụ ụda ọdịda gị, mgbe onye e merụrụ ahụ́ nke ukwuu na-asụ ude, mgbe e gburu mmadụ n’ime gị, ọ̀ bụ na agwaetiti dị iche iche agaghị ama jijiji?+
“‘Gị onye bi n’ọnụ ọnụ oké osimiri,+ nwaanyị nke ya na ndị dị iche iche ndị si n’ọtụtụ agwaetiti na-azụkọ ahịa,+ nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Taya, gị onwe gị sịrị, ‘Ezuru m okè n’ịma mma.’+