24 Ị ga-eji ájá wuoro m ebe ịchụàjà,+ ị ga-achụkwa àjà nsure ọkụ gị na àjà udo gị, ìgwè atụrụ gị na ìgwè ehi gị,+ n’elu ya. N’ebe ọ bụla m ga-eme ka a na-echeta aha m ka m ga-abịakwute gị, m ga-agọzikwa gị.+
9 Mgbe unu laghachikwutere m,+ debekwa ihe niile m nyere n’iwu+ ma mee ha,+ ọ bụrụgodị na ndị unu a chụsasịrị achụsasị nọ na nsọtụ eluigwe, m ga-esi n’ebe ahụ chịkọta+ ha, kpọlatakwa ha+ n’ebe ahụ m họọrọ ime ka aha m biri na ya.’+