Diuterọnọmi 30:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Ọ bụrụ na ndị gị a chụsasịrị achụsasị anọrọ na nsọtụ eluigwe, Jehova bụ́ Chineke gị ga-esi n’ebe ahụ chịkọta gị, sikwa n’ebe ahụ kpọrọ gị.+ Abụ Ọma 106:47 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 47 Jehova Chineke anyị, biko, zọpụta anyị,+Sikwa ná mba dị iche iche chịkọta anyị,+Ka anyị wee nye aha nsọ gị ekele,+Jirikwa ọṅụ too gị.+ Aịzaya 11:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Ọ ga-ewelikwara mba niile ihe mgbaàmà wee kpọkọta ndị Izrel a chụsara achụsa.+ Ọ ga-esikwa na nsọtụ anọ nke ụwa kpọkọta ndị Juda a chụsara achụsa.+ Jeremaya 12:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Ọ ga-erukwa na mgbe m fopụchara ha, m ga-emere ha ebere+ wee kpọghachite onye nke ọ bụla n’ihe nketa ya, kpọghachitekwa onye nke ọ bụla n’ala ya.”+
4 Ọ bụrụ na ndị gị a chụsasịrị achụsasị anọrọ na nsọtụ eluigwe, Jehova bụ́ Chineke gị ga-esi n’ebe ahụ chịkọta gị, sikwa n’ebe ahụ kpọrọ gị.+
47 Jehova Chineke anyị, biko, zọpụta anyị,+Sikwa ná mba dị iche iche chịkọta anyị,+Ka anyị wee nye aha nsọ gị ekele,+Jirikwa ọṅụ too gị.+
12 Ọ ga-ewelikwara mba niile ihe mgbaàmà wee kpọkọta ndị Izrel a chụsara achụsa.+ Ọ ga-esikwa na nsọtụ anọ nke ụwa kpọkọta ndị Juda a chụsara achụsa.+
15 Ọ ga-erukwa na mgbe m fopụchara ha, m ga-emere ha ebere+ wee kpọghachite onye nke ọ bụla n’ihe nketa ya, kpọghachitekwa onye nke ọ bụla n’ala ya.”+