20 ruo mgbe Jehova ga-eme ka ụmụnne unu zuru ike, dị ka unu onwe unu, ha enwetakwa ala ahụ nke Jehova bụ́ Chineke unu na-enye ha n’ofe Jọdan; e mesịa, onye ọ bụla n’ime unu ga-alọghachi n’ihe nketa ya nke m nyere unu.’+
11 A ga-achịkọta ụmụ Juda na ụmụ Izrel ka ha dịrị n’otu,+ ha ga-eme otu onye onyeisi ha wee si n’ala ahụ pụọ,+ n’ihi na ụbọchị Jezril ga-abụ ụbọchị ukwu.+
14 M ga-akpọkọta ndị a dọọrọ n’agha n’ime ndị m Izrel.+ Ha ga-ewukwa ebe ndị tọgbọrọ n’efu ma biri n’ime ha,+ kọọ ubi vaịn ma ṅụọ mmanya ha, kọọkwa ubi ma rie mkpụrụ ha.’+
20 N’oge ahụ, m ga-akpọbata unu, ọbụna n’oge m ga-achịkọta unu. N’ihi na m ga-eme ka unu nwee aha na otuto n’etiti ndị niile nọ n’ụwa, mgbe m ga-achịkọtaghachi ndị unu a dọọrọ n’agha n’ihu unu,” ka Jehova kwuru.+