18 N’oge ahụ, ụlọ Juda na ụlọ Izrel+ ga-ejekọ+ ije, ha niile ga-esoro si n’ala dị n’ebe ugwu pụta wee banye n’ala m nyere nna nna unu hà ka ọ bụrụ ihe nketa ha.+
3 N’ihi na, “lee! oge na-abịa,” ka Jehova kwuru, “mgbe m ga-achịkọta ndị m a dọọrọ n’agha, bụ́ Izrel na Juda,”+ ka Jehova kwuru, “m ga-akpọlata ha n’ala m nyere ndị nna nna ha, ha ga-ebirighachi na ya.”’”+
12 “‘M ga-achịkọta Jekọb, unu dum;+ aghaghị m ịchịkọta ndị Izrel fọdụrụnụ.+ M ga-eme ka ha dịrị n’otu, dị ka ìgwè atụrụ nke nọ n’ogige atụrụ, dị ka ìgwè anụ nke nọ n’ebe ha na-ata ahịhịa;+ a ga-eme mkpọtụ na ha n’ihi ndị mmadụ.’+
26 otú a ka a ga-esikwa zọpụta Izrel+ dum. Dị nnọọ ka e dere, sị: “Onye nnapụta ga-esi na Zayọn pụta+ wee mee ka ụmụ Jekọb kwụsị ime omume asọpụrụghị Chineke.+