22 ‘“A ga-eburu ha laa Babịlọn,+ ọ bụkwa n’ebe ahụ ka ha ga-adị ruo mgbe m ga-elebara ha anya,”+ ka Jehova kwuru. “M ga-ebugote ha wee bulata ha ebe a.”’”+
14 M ga-ekwe ka unu chọta m,’+ ka Jehova kwuru. ‘M ga-akpọkọta ndị unu a dọọrọ n’agha, sikwa ná mba niile na ebe niile m chụsasịrị unu kpọkọta unu,’+ ka Jehova kwuru. ‘M ga-akpọlatakwa unu n’ebe m mere ka e si dọrọ unu n’agha.’+
25 “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ugbu a ka m ga-akpọghachite ndị Jekọb+ a dọọrọ n’agha, meekwara ụlọ Izrel dum ebere.+ M ga-ekworo aha nsọ m ekworo.+
14 M ga-akpọkọta ndị a dọọrọ n’agha n’ime ndị m Izrel.+ Ha ga-ewukwa ebe ndị tọgbọrọ n’efu ma biri n’ime ha,+ kọọ ubi vaịn ma ṅụọ mmanya ha, kọọkwa ubi ma rie mkpụrụ ha.’+