Diuterọnọmi 30:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Jehova bụ́ Chineke gị ga-akpọghachite ndị gị a dọọrọ n’agha+ wee meere gị ebere+ ma si n’etiti ndị niile Jehova bụ́ Chineke gị chụsasịrị gị kpọghachite gị.+ Ezra 5:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Arịa ọlaedo na nke ọlaọcha+ nke ụlọ Chineke, bụ́ ndị Nebukadneza bupụtara n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, wee bute ha n’ụlọ nsọ Babịlọn,+ ọ bụ ihe ndị a ka eze Saịrọs+ bupụtara n’ụlọ nsọ Babịlọn nyefee Sheshbaza,+ bụ́ aha onye o mere gọvanọ.+ Ezra 7:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 Arịa+ a na-ebunye gị maka ije ozi n’ụlọ Chineke gị, buga ha niile na Jeruselem n’ihu Chineke gị.+
3 Jehova bụ́ Chineke gị ga-akpọghachite ndị gị a dọọrọ n’agha+ wee meere gị ebere+ ma si n’etiti ndị niile Jehova bụ́ Chineke gị chụsasịrị gị kpọghachite gị.+
14 Arịa ọlaedo na nke ọlaọcha+ nke ụlọ Chineke, bụ́ ndị Nebukadneza bupụtara n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, wee bute ha n’ụlọ nsọ Babịlọn,+ ọ bụ ihe ndị a ka eze Saịrọs+ bupụtara n’ụlọ nsọ Babịlọn nyefee Sheshbaza,+ bụ́ aha onye o mere gọvanọ.+