Ezra
5 Hagaị+ onye amụma na Zekaraya+ nwa nwa Ido+ onye amụma buuru ndị Juu nọ na Juda na Jeruselem amụma n’aha+ Chineke Izrel, bụ́ onye nọnyeere ha.+ 2 Ọ bụ mgbe ahụ ka Zerọbabel+ nwa Shieltiel+ na Jeshụa+ nwa Jehọzadak biliri wee malite iwughachi ụlọ Chineke nke dị na Jeruselem; ndị amụma Chineke,+ bụ́ ndị na-enyere ha aka, sokwa ha. 3 N’oge ahụ, Tatenaị+ bụ́ gọvanọ ofe Osimiri Yufretis+ na Shita-bọzenaị na ndị ọrụ ibe ha bịakwutere ha, ha nọkwa na-agwa ha, sị: “Ònye nyere unu iwu ịrụ ụlọ a na iwucha ogidi a?”+ 4 Ha wee sị ha: “Gịnị bụ aha ndị ikom na-ewu ụlọ a?” 5 Anya+ Chineke ha dị n’ahụ́+ ndị okenye ndị Juu, ha akwụsịghịkwa ha ruo mgbe akụkọ ahụ ruru Darayọs ntị, e zitekwa akwụkwọ ozi e dere banyere ihe a.
6 Nke a bụ ihe e dere+ n’akwụkwọ ozi ahụ Tatenaị+ bụ́ gọvanọ ofe Osimiri Yufretis+ na Shita-bọzenaị+ na ndị ọrụ ibe ha,+ ndị gọvanọ ọkwá ha dị ala bụ́ ndị nọ n’ofe Osimiri, zigaara eze Darayọs ; 7 ha zigaara ya ozi, e dekwara n’ime ya, sị:
“Eze Darayọs:
“Udo dịrị gị!+ 8 Ka eze mara na anyị gara n’ógbè Juda a na-achị achị,+ n’ụlọ Chineke ukwu ahụ,+ e ji nnukwu nkume na-ewu ya, a na-etinyekwa osisi ná mgbidi ya; e jikwa ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ ahụ, ọ na-agakwa n’ihu n’aka ha. 9 Anyị wee jụọ ndị okenye a ajụjụ. Nke a bụ ihe anyị gwara ha: ‘Ònye nyere unu iwu ịrụ ụlọ a na iwucha ogidi a?’+ 10 Anyị jụkwara ha aha ha, ka anyị mee ka ị mara, ka anyị wee dee aha ndị ikom ahụ bụ́ ndị isi ha n’akwụkwọ.+
11 “Nke a bụkwa ozi ha zighachiiri anyị, sị: ‘Anyị bụ ndị ohu Chineke nke eluigwe na ụwa,+ anyị na-ewughachi ụlọ e wuru ọtụtụ afọ gara aga, nke otu eze ukwu nke Izrel wuru wee wuchaa.+ 12 Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ndị nna anyị kpasuru Chineke nke eluigwe iwe,+ o nyefere+ ha n’aka Nebukadneza+ eze Babịlọn, onye Kaldia,+ ọ kwadakwara ụlọ a+ wee dọrọ ndị anyị n’agha laa Babịlọn.+ 13 Otú o sina dị, n’afọ mbụ nke Saịrọs+ eze Babịlọn, eze Saịrọs nyere iwu ka e wughachi ụlọ Chineke a.+ 14 Arịa ọlaedo na nke ọlaọcha+ nke ụlọ Chineke, bụ́ ndị Nebukadneza bupụtara n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, wee bute ha n’ụlọ nsọ Babịlọn,+ ọ bụ ihe ndị a ka eze Saịrọs+ bupụtara n’ụlọ nsọ Babịlọn nyefee Sheshbaza,+ bụ́ aha onye o mere gọvanọ.+ 15 O wee sị ya: “Buru arịa ndị a.+ Gaa debe ha n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem, ka e wughachi ụlọ Chineke n’ebe ahụ ọ dịbu.”+ 16 Mgbe Sheshbaza bịara, ọ tọrọ ntọala ụlọ Chineke,+ nke dị na Jeruselem; malitekwa mgbe ahụ ruo ugbu a, a nọwo na-ewughachi ya, ma e wuchabeghị ya.’+
17 “Ugbu a, ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka a gaa n’ụlọ akụ̀ eze nke dị na Babịlọn chọpụta+ ma ọ̀ bụ eziokwu na eze Saịrọs nyere iwu+ ka e wughachi ụlọ Chineke nke dị na Jeruselem; ka eze zitekwara anyị ihe o kpebiri banyere ihe a.”