2 “Nke a bụ ihe Saịrọs eze Peshia kwuru,+ ‘Jehova bụ́ Chineke nke eluigwe+ enyewo m alaeze niile nke ụwa,+ ya onwe ya enyewokwa m ọrụ iwuru ya ụlọ na Jeruselem,+ nke dị na Juda.
3 “N’afọ mbụ nke ọchịchị Eze Saịrọs,+ Eze Saịrọs nyere iwu banyere ụlọ Chineke nke dị na Jeruselem. ‘Ka e wughachi ụlọ ahụ ka ọ bụrụ ebe ha ga na-achụ àjà,+ a ga-atọkwa ntọala ya, ọ ga-adị kubit iri isii n’ịdị elu, dịrịkwa kubit iri isii n’obosara,+