14 M ga-akpọkọta ndị a dọọrọ n’agha n’ime ndị m Izrel.+ Ha ga-ewukwa ebe ndị tọgbọrọ n’efu ma biri n’ime ha,+ kọọ ubi vaịn ma ṅụọ mmanya ha, kọọkwa ubi ma rie mkpụrụ ha.’+
20 N’oge ahụ, m ga-akpọbata unu, ọbụna n’oge m ga-achịkọta unu. N’ihi na m ga-eme ka unu nwee aha na otuto n’etiti ndị niile nọ n’ụwa, mgbe m ga-achịkọtaghachi ndị unu a dọọrọ n’agha n’ihu unu,” ka Jehova kwuru.+