14 M ga-ekwe ka unu chọta m,’+ ka Jehova kwuru. ‘M ga-akpọkọta ndị unu a dọọrọ n’agha, sikwa ná mba niile na ebe niile m chụsasịrị unu kpọkọta unu,’+ ka Jehova kwuru. ‘M ga-akpọlatakwa unu n’ebe m mere ka e si dọrọ unu n’agha.’+
14 M ga-akpọkọta ndị a dọọrọ n’agha n’ime ndị m Izrel.+ Ha ga-ewukwa ebe ndị tọgbọrọ n’efu ma biri n’ime ha,+ kọọ ubi vaịn ma ṅụọ mmanya ha, kọọkwa ubi ma rie mkpụrụ ha.’+