25 Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “A ga-anapụ dike ọbụna ndị ọ dọọrọ n’agha,+ ndị onye na-achị n’aka ike kpụụrụ ga-agbalagakwa.+ Onye ọ bụla nke na-alụso gị ọgụ ka m ga-alụso ọgụ,+ m ga-azọpụtakwa ụmụ gị.+
3 N’ihi na, “lee! oge na-abịa,” ka Jehova kwuru, “mgbe m ga-achịkọta ndị m a dọọrọ n’agha, bụ́ Izrel na Juda,”+ ka Jehova kwuru, “m ga-akpọlata ha n’ala m nyere ndị nna nna ha, ha ga-ebirighachi na ya.”’”+
28 “‘Ha ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova Chineke ha, mgbe m mere ka a dọrọ ha n’agha laa ná mba dị iche iche, kpọkọtakwa ha n’ala ha,+ ka m wee ghara ikwe ka otu n’ime ha fọdụ n’ebe ahụ ọzọ.+