27 “‘Ma gị onwe gị, ohu m Jekọb, atụla egwu, atụla ụjọ, gị Izrel.+ N’ihi na, lee, m ga-azọpụta gị n’ebe dị anya ị nọ, m ga-azọpụtakwa ụmụ gị n’ala a dọọrọ ha n’agha laa.+ Jekọb ga-alọta, ọ gaghịkwa enwe nsogbu, ahụ́ ga-erukwa ya ala, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ọ maa jijiji.+