7 Ọ ga-aghọkwa ógbè nke ndị fọdụrụ n’ụlọ Juda.+ Ha ga-atakwa nri na ya. Ha ga-edina n’ụlọ ndị dị n’Ashkelọn ná mgbede wee tụsara ahụ́. N’ihi na Jehova Chineke ha ga-eche ihu ya n’ebe ha nọ+ wee chịkọtaghachi ndị a dọọrọ n’agha n’ime ha.”+
20 N’oge ahụ, m ga-akpọbata unu, ọbụna n’oge m ga-achịkọta unu. N’ihi na m ga-eme ka unu nwee aha na otuto n’etiti ndị niile nọ n’ụwa, mgbe m ga-achịkọtaghachi ndị unu a dọọrọ n’agha n’ihu unu,” ka Jehova kwuru.+