4 A gakwaghị akpọ gị nwaanyị a hapụrụ kpamkpam;+ a gakwaghị asị na ala gị bụ ebe tọgbọrọ n’efu;+ kama a ga-akpọ gị Onye Ihe Ya Na-atọ M Ụtọ,+ kpọọkwa ala gị Nwunye E Nwe Enwe. N’ihi na ihe gị ga-atọ Jehova ụtọ, a ga-enwekwa ala gị enwe dị ka nwunye.+