40 Ndagwurugwu ozu+ dum na ndagwurugwu a na-awụnye ntụ+ ya na abụba gwakọtara nakwa mbara ala niile ruo na ndagwurugwu Kidrọn,+ ruo n’akụkụ Ọnụ Ụzọ Ámá Ịnyịnya+ nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, ga-abụ ihe dị nsọ nye Jehova.+ A gaghị efopụ ya efopụ, a gaghịkwa etida ya ọzọ ruo mgbe a na-akaghị aka.”+